Job 24

1“Gịnị mere Onye pụrụ ime ihe niile adịghị ahọpụta oge maka ikpe ikpe?
Gịnị mere ndị maara ya ga-eji na-ele anya nʼefu maka oge ndị a?
2Ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ewezuga nkume oke ala,
na-elekọta igwe atụrụ ha zutere nʼohi.
3Ha na-apụnara ịnyịnya ibu nke nwa mgbei,
ha na-anarakwa ehi nke nwanyị di ya nwụrụ nʼihe ebe.
4Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa.
Ha na-ejikwa aka ike mee ka ndị ogbenye dị nʼala ahụ zoo onwe ha.
5Dịka ịnyịnya ibu ọhịa nọ nʼọzara,
otu a ka ndị ogbenye si agagharị na-achọgharị ihe oriri,
ala na-adịghị epupụta ihe na-enye ụmụ ha nri.
6Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi,
na-atụtụkọtakwa mkpụrụ vaịnị nke fọdụrụ nʼubi ndị ajọ omume.
7Nʼihi enweghị uwe, ha na-agba ọtọ nʼabalị,
ha enwekwaghị akwa iji kpuchie onwe ha oyi.
8Oke mmiri ozuzo nke ugwu na-ede ha ahụ,
ha na-amaku nkume nʼihi enweghị ebe mgbaba.
9Nwa na-enweghị nna ka a na-eji ike napụ ara.
Nwa ọhụrụ nke onye ogbenye ka a na-anara nʼihe ebe.
10Nʼihi enweghị akwa ha na-agba ọtọ na-agagharị,
ha na-ebu ukwu ọka ma nọrọ nʼagụụ.
11Ha na-asụpụta mmanụ oliv nʼelu ebe e mebere maka ya,
ha na-azọchapụta mmanya vaịnị ma akpịrị na-akpọ ha nkụ.
12Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili,
mkpụrụobi nke ndị e merụrụ ahụ na-eti mkpu enyemaka.
Ma ọ dịghị onye Chineke na-ahụta ka onye ikpe mara nʼihi ihe ndị a.

13“Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè,
ndị na-amaghị ụzọ ya
maọbụ na-anọgide nʼụzọ ya.
14Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili,
gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa;
nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi.
15Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji;
ọ na-eche nʼobi ya sị, ‘Ọ dịghị onye ọbụla ga-ahụ m,’
ọ na-ekpuchikwa ihu ya.
16Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa,
ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ;
o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ.
17Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha,
ha na ihe egwu nke ọchịchịrị bụ enyi.

18“Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri;
ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ,
nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha.
19Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee,
otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike.
20Akpanwa na-echefu ha,
ikpuru na-eji ha mere ihe oriri;
anaghị echetakwa ndị ajọọ omume
kama a na-etiji ha dịka osisi.
21Ha na-akpagbu nwanyị aga na nwanyị na-enweghị nwa,
ha adịghị elekọta nwanyị di ya nwụrụ.
22Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ,
ọ bụ ezie na ha bụ ndị ihe na-agara nke ọma, ma ha enweghị nkwa nke ndụ.
23Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha,
ma anya ya dịkwasịrị ụzọ ha niile.
24A na-ebuli ha elu nwa mgbe nta, ma e mesịa, ha anọkwaghị,
a na-eweda ha nʼala chikọtakwa ha dịka ndị ọzọ,
a na-ebipụ ha dịka ukwu ọka.

25“Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, onye pụrụ ị sị na ihe m kwuru bụ okwu ụgha
si otu a mee ka okwu m bụrụ ihe efu?”
Copyright information for IboBIU